Psalms 66

Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma.

Abụ ekele

1Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
2Bụọ abụ banyere ebube aha ya;
meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!
Ike gị dị nnọọ ukwu,
ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;
ha na-abụku gị abụ otuto,
ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela

5Bịa lee ihe Chineke mere,
ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, a
ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee b;
bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,
anya ya na-elekwa mba niile,
ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile,
kwere ka a nụ ụda otuto ya;
9O chebela ndụ anyị,
ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;
ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
11Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,
ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
12I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;
anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee.
Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.

13Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,
imezu nkwa m kwere gị
14nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,
ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
15Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja,
ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule;
Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela

16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke;
ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
17Eji m ọnụ m kpọkuo ya;
otuto ya dị m nʼire.
18Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m,
Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
19ma Chineke gere ntị nʼezie,
nụrụkwa olu arịrịọ m.
20Otuto dịrị Chineke,
onye na-ajụghị ekpere m
maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
Copyright information for IboBIU